Bliss Essences

the journey to unveiling all my innermost longings and passions of quest , thoughts and reflections on the full depth of life and faith in the Lord Jesus Christ who is the true knowledge of God! - John 17 : 3
- Apostle Dr. Patrice Yehuda

Friday, November 9, 2018

OKWU ABALI ITOOLU

#listentodrpatriceyehuda

UPON THE WATCH

OKWU ABALI ITOOLU NA ONWA IRI NA OTU AFO 2018

Onye Ochie ahu nke no na oche eze ebighi ebi ekwuwo ya si,

Onye Ochie ahu bu ezemmuo nile na eze elu-igwe na uwa nile ekwuwo ya si,

Onye Ochie ahu bu Onye eziokwu na ezi-omume ekwuwo ya si na onweghi ike mba ekwensu naijiria ga enwe ga enwe ike merie Biafra ozo na ihe obula omasiriya buru!

Onye Ochie ahu bu ya nwe ishi-okwu nile!

Ndi Ochie ebighi-ebi ezukola we maa obodo naijiria na ndi na eche ya nche oke ikpe di egwu!

Naijiria a gaghi enwe ike iguzo kwa ozo rue mgbe uwa nile gwusiri!

Agu na eche mba umuBiafra a puta go! Jihovah nke usu nile nke ndi agha ebighi-ebi a puta go!

Ka ma Biafra ga ada ada ozo na agha uwa nile ga ata oke afufu!

Ka ma Biafra ga ada ada ozo, a ga etipia obodo ekwensu bu naijiria mee ya obodo na agaghi enwe ike imi nkpuru rue mgbe oge nile gwusiri!

Onye Ochie ahu bu Onye nwe ike nile na ihe nile, o bu kwa ya nwe ishi okwu nile nke ekwuru ekwu ma nke na ekwughi ekwu!

ISHI OKWU NILE SI NA ISHI IYI NKE NDU  EBIGHI-EBI WEE PUTA!

Onye na atu egwu atu si na egwu obula ozo!

Onye na eme nkuja e me si na nkuja obula ozo!

Ihe di egwu nke mmadu na atughi anya ya ga eme maka nihi #Biafra!

Onye nwere nti ya nuru okwu a nile!

Kaa Onye Ochie ahu bu Odum egwu Judah na Agu na eche mba UmuBiafra nile gozie ala-nso Biafra na ndi nile huru ya na anya!

Under Solemn Oath

Shi ya nje!
DrPatrice Yehuda

Please SHARE wide now

No comments:

Post a Comment